Ochichi Enugu State Ekwuputala Mmechi Ufodu Okporo Uzo Na Isi Obodo Enugu Maka Obibia Tinubu Na Abia State A
Written by admin on November 27, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Govt Enugu State emela ka amata na aga emechisi ufodu okporo uzo dina isi obodo Enugu nwa obere oge echi bu Saturday maka njem achum nta nkwado President Bola Ahmed Tinubu ga awuchi na State a.
Na ozi onyefere ndi nta akuko taata bu Friday ka Commissioner State a na ahu maka mgbasa ozi nakwa nzikorita ozi bu Dr Malachy Agbo mere ka amata na ufodu na ime habu okporo uzo nke a ga emetuta gunyere okporo uzo ndi putagasiri na mpaghara Ogui Road, dika nke Old Govt House Lodge, Abakpa Junction, North West Junction nakwa Mega Junction.
Okporo uzo ndi putagasiri na Otigba Roundabout dika: New Haven by Bisala Junction, Bisala Road by Pascal and Jake’s Bus Stop, Bisala by Roban Store nakwa Ogui Road by Old Artisan.
Nke ozo bu okporo uzo ndi putagasiri Presidential Road, Okpara Square nakwa Govt House dika: Toscana Roundabout, Liberty Estate/Spar Junction, ESBS and Library Junction, Agric Bank Bus Stop nakwa Virgin Forest Junction.
Na oge ona ayo ndi okpu ugboala nakwa ndi njem okporo uzo ka ha hazigharie onodu njem ha echi na isi obodo Enugu ka Dr Agbo kwuputara na ufodu ebe ndi ugboala ga agba echi oge ahu President Tinubu ga anona State a gunyere: Abakpa Junction – Enugu – Port Harcourt Expressway, Trans-Ekulu Flyover – ShopRite Junction – All Saints Junction ruo Holy Ghost, New Haven Primary School – Nza Street – Toscana Roundabout – Agric Bank ruo ESBS nakwazi ebe ndi ozo.
