Ahmed Musa n’agbara otu egwuregwu Super Eagles ala anyị alụola nwunye nke anọ ya.
Written by Onyinye on June 2, 2025
Ọgba bọọlụ ama ama n’otu Super Eagles bụ Ahmed Musa alụbatala nwunye nke anọ ya bụ Asmau Moriki.
Mmemme alụmdi na nwunye ha bụ nke ana achọghị ka ọhaneze sonyere were ọnọdụ kpọmkwem na Kano State.
Nwa amadi ahụ ụkwụ na aghọ nke lụrụ nwunye nke mbụ ya bụ Jamila n’afọ 2013 mana ha abụọ mechara kewaa onwe ha ka o mechara afọ anọ há lụrụ onwe ha ma mụta ụmụaka abụọ.
Ahmed Musa gara n’ihu lụọ nwaanyị ọzọ bụ Juliet Ejue sitere Cross River state ozugbo yana Jamila kewachara.
Yana Juliet mechakwara kewaa n’otu aka ahụ ka o mechara ọtụtụ afọ.
Ọ bịara lụọ nwaanyị nke atọ bụ Miriam afọ atọ gara aga. Mana ugbua ya onye ọgba bọọlụ emezuola ya ndị inyom anọ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.