Aka Na Achi Ebonyi State Enyela Ohere Agum Akwukwo Na Afu gaara Nari Kwuru Nari Umuakwukwo Mahadum Na State Ahu.

Written by on March 16, 2026

by Maduabuchi Onwe

Aka na achi Ebonyi bu governor Francis Ogbonna Nwifuru enyela ohere agumakwukwo na efu gara umu akwukwo di otu nari, iri asaato na asaa na ulo akwukwo mahadum University of ICT, Science and Technology dinadina Oferekpe nke Izzi LGA na state ahu.

Governor Nwifuru mere ka nke a puta ihe na oge mmeme inabata umu-akwukwo ohuru akporo Matriculation nke izizi ya na yabu ulo akwukwo mahadum nke afo a bu 2026 na state ahu.

Ogakwara na iru mee ka amata na yabu ulo akwukwo mahadum ka eguzobere naani maka ikuziri umu akwukwo ihe gbasara nkanuzu ogbara ohuru gunyere ihe omimi science nke oma na state ahu.

Na ikpazu ka okeleziri ndi nille ihe oma na amasi weputara ala ha na Oferekpe nke state ahu maka irunye yabu ulo akwukwo mahadum University of lCT, Science and Technology.

Iga echetazi na obu kemgbe afo 2021 ka amalitere olu yabu ulo akwukwo mahadum na obodo Oferekpe nke dina lzzi LGA na Ebonyi State.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited