Aka na achi lmo state ekwuputala njikere odi maka ikwalite odimma otu NYSC.

Written by on May 14, 2025

Aka na achi lmo state bu governor Hope Uzodimma eferela ntutu taa na ochichi ya ga aga na iru ihu na ihe gbasara odimma otu ahu jikotara umuafor ala anyi ji otu afo efee ala nna ha bu National Youth Service Corps(NYSC) bu nke ejiri kporo mkpa okachasi na state ahu.

Governor Uzodimma mere ka nke a puta ihe na okwu ya oge ana emechi omumu ihe yabu otu NYSC were onodu na Eziama-Obaire na Nkwerre local government area nke state ahu.

Governor Uzodimma nke onye nnochitere anya ya na yabu mmeme bu onye isi otu NYSC bu Dr. Mandela Ukaegbu kowara oru otu NYSC dika ihe na akwalite mmepe akunabu na odi mma ndi mmadu na state ahu, ebe yana amuma renewed hope nke state ahu dika aki na ukwa.

Na nke ya ka onye isi otu NYSC na lmo state na okwa coordinator bu maazi Evans Okwor toro governor Hope Uzodimma maka ihunanya ya na ebe ndi NYSC noo, dika okpokuru ndi nille sonyere na ihe omumu NYSC ahu ka ha jisike tinye ihe obuna ha mutara na oru.

Mmadu ato na ime ndi ahu ji otu afo efe ala nna ha na state ahu nwetekwara ihe nrite ego site na aka chief Uche Nwosu maka ezigbo oru ha na oge omumu ihe ahu ha mere.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited