Aka ndi nchekwa akpatala di na nwunye na atu mgbere egbe na Delta state
Written by Onyinye on March 15, 2025
Aka ndi nchekwa akporo CP -special assignment team nke Delta state police command, akpatala otu nwoke na nwunye ya enyere aha ha dika Mazi na odoziaku Joshua Bogbon Godwill, ndi nke bi na mpaghara Okpe local government Area nke state ahu, kwere maka ebubo na ha na atu mgbere egbe.
Ndi nta akuko nwetara ozi na anwuchiri ndi a ana enyo enyo n’ oge oji okpara gata elekere abuo nke ehihie na abali itolu nke onwa March afo a bu 2025 ma naputa ha otu egbe fabricated Beretta pistol nakwa ngbo egbe di ndu, bu nke ha n’ akwado Ije bugara onye ahia ha na sapele.
Ozi kowara n’ obu site n’ ozi ndi uwe oji ahu nwetara ka ha jiri ga olu n’ ebe obibi di na nwunye a.
N’ ozi obinyere aka ma nyefe ndi nta akuko unya bu Thursday, ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Delta state bu SP Bright Edafe noro me ka amata na nwunye nwoke a bu odoziaku Uche Joshua ejirigo onu ya kweta na ya na ekesa yabu egbe ma n’ akowakwa na ya ebugagoro otutu ndi ahia ha egbe ndi a na mpaghara warri nakwa sapele dika di ya siri nye ntuziaka.
Ozi a kowara na anoro oge nnyocha n’ aga n’ iru,nwuchie otu nwoke ozo bu onye otu ha enyere aha ya dika Junior Moses ogedegbe gbara afo iri ato ma buru nwa afo Obodo Useifurun dina Ughelli south LGA na state ahu.
SP Edefe mekwara ka amata na ndi nchekwa gakwara n’ iru nwuchie otutu ndi otu nzuzo nakwa ndi ekperima ndi ozo ana acho acho na mpaghara ndi ozo nke state ahu ma naputakwa ha otu egbe Beretta pistol,otu cut to size gun, nakwa ngbo egbe di ndu di iri abuo na ano.
Habu ndi uwe oji kowara na nnyocha mbuzo emere n’ egosi na ndi a ana enyo enyo so n’ otu akporo Vikings confractanity ma n’ akowakwa na nnyocha kana agakwa n’ iru.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.