Aka ndi uwe oji akparala maazi Ikemefuna Ossaai ka orichara mbombo oso.
Written by Onyinye on May 14, 2025
Ndi uwe oji ala anyi na Anambra state emela ka amata na ha anwuchigo maazi Ikemefuna Ossai nke ugboro abuo ya ka ogbachara oso, bu onye ana enyo enyo na aka ya di na oba ekere ede gbasara onwu nwamadi ahu na annochite anya ogbo nta vote Onitsha 1 constituency na ulo nzuko omebe iwu Anambra state bu Hon. Justice Azuka.
Onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Anambra state bu SP Tochukwu Ikenga mere ka amata na yabu nwuchiko bu kwere maka ubura mmamihe habu ndi uwe oji.
SP Tochukwu Ikenga kowakwara maazi Ikemefuna Ossaai dika onye aka ndi uwe oji kpatagoro na mbu, mana omeghariri ndi uwe oji anya we rie mbombo oso gbaga na states di iche iche na ala anyi a nakwa ufodu mba ndi ahu nodebere ala anyi nso.
SP Ikenga gakwara na iru mee ka amata na yabu nwamadi ka nwuchiko na abali asaa nke onwa May afo a anyi no na ime ya na Asaba bu isi obodo Delta state.
Yabu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji kowakwara na yabu nwamadi choburu irie mbombo oso oge ha na acho nwuchiko ya, nke mere mgbo jiri tuo yabu enwe na ukwu
SP Tochukwu Ikenga kowakwara na ha ezipugo ozi gara ezinaulo Hon. Justice Azuka lagoro mmuo nakwa ndi ulo nzuko omebe iwu state ahu, iji hu na yabu ezekudele ka ajuru mmuo chiri ya ozo.
Onye commissioner ndi uwe oji ala anyi na Anambra state bu maazi lkioye Orutugu bu onye gosiputara obi nghute ya etu ndi uwe oji siri hapu nwamadi ahu ka orie mbombo oso na oge mbu, doro aka na nti ka oghara ime ozo.
Wee gbakwunye na ha ka na esi ime nyocha na ala ichoputa ndi ozo aka ha di na oba ekere ede gbasara onwu Hon. Justice Azuka, dika ozi ha natagoro na aka nke maazi Ikemefuna Ossaai ga nyere ha aka nwuchiko ndi ozo osiso.
Na ikpazu ka SP Ikenga kwere nkwa na habu ndi uwe oji ga agba mbo hu na ndi nille aka ha di na yabu onwu nwamadi ka nwuchiko ma nye ha ntara mahuhu kwesiri ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.