Aka ndi uwe oji akpatala ufodu ndi ana enyoenyo na agwa ekperima na Enugu State.
Written by Onyinye on June 26, 2025
Aka ndi uwe oji ala anyi na Enugu State akpala umunwoke ano ana enyoenyo maka ebubo agwa ekperima ndi gunyere: igba izu ojo, iji egbe gaa ori, ijide ngwa ogu na uzo megidere iwu nakwa otu nzuzo.
Nke a bu dika osiri di na mbo habu ndi uwe oji na agba ikpochapu ndi ahu jugoro inwe ncheghari na agwa ekperima ha na State a.
Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi unya bu Wednesday ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji na State a bu SP Daniel Ndukwe mere ka amata na umunwoke ano a aka kpatara gunyere: Esomchi Ugwu gbara afo iri abuo na isii, Kosisochukwu Ukwuani gbara afo iri na iteolu, Izuchukwu Anyanwu Gabriel nakwa Ogbodo Friday Onyekachi.
SP Ndukwe kowara na ihe anaputara na aka ndi a anwuchikoro gunyere: egbe ato, mkpa oku yiri egbe na udi akporo Gun-like VL-Lighter Electronic Gas Igniter, mgbo egbe asato dicha ndu nakwa ihe ndi ozo ana enyoenyo.
Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Enugu State gwara ngalaba akuko uwa anyi na obu ndi uwe oji sitere ngalaba Crack Tactical Squad, nke ngalaba Anti-Cultism Tactical Squad, nakwa ndi uwe oji sitere mpaghara New Haven Police Division sitere na enyemaka ndi nche Neighborhood Watch jichie ndi a na mpaghara di ichiche na State a.
SP Daniel Ndukwe kowara na mpaghara ndi ahu anwuchikoro ndi a ana enyoenyo gunyere: Enugu-Ngwo nke Udi LGA, Ndiagu-Ugwuaji nke Enugu South LGA nakwa mpaghara New Haven nke isi obodo Enugu.
Na ikpeazu ka SP Ndukwe kwuputara na Commissioner ndi uwe oji ala anyi na State a bu CP Mamman Bitrus Giwa noro na oge ona ekene ndi uwe oji nwuchikoro ndi a maka ezi mbo ha yoo ha nakwa ndi isi ngalaba gunyere mpaghara di ichiche habu ndi uwe oji ka ha nogidesie ike na ezi olu ikpochapu agwa ekperima na mpaghara niile nke State a.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.