Aka ndị uweojii akpatala mmadụ atọ ana enyo enyo na ha bu ndi oji egbe aga na Anambra State.

Written by on June 2, 2025

Aka ndị uweojii na Anambra State akpatala mmadụ atọ ana enyo enyo na ha so n’otu ndị oji egbe aga bu ndi aka ọrụ ha bu iji egbe punari ndị mmadụ ihe ha nwere n’ike ọkachasi ọgbọ ala.

N’ozi putara ihe taata bu Monday site n’aka ọnụ na ekwuchitere ndị uweojii na State ahụ bu SP Tochukwu Ikenga, kọwara na anwụchiri mmadụ atọ ahụ ana enyo enyo kwere maka nkwuputa onye nọ n’aka ndị uweojii mere.

Ikenga mere ka amata na ndị uweojii agbakwụnyere ndị Rapid Response Squad na Awkuzu bu ndị zọpuru njem nwuchi ahụ gawa na Agukwu-Nri, Anaocha LGA na State ahụ n’ụbọchi Saturday.

Okwuru na ndị ọrụ nchekwa ahụ nwetara automatic pump action gun, nakwa ihe ndị ọzọ ana enyo enyo na ha zuru ezu ndị gụnyere ụgbọala white Mercedes Benz C300 4matic nke akara Reg. Number ya bu KWC 140, ụgbọala Ash Lexus 350 nke akara Reg number ya bu 669 CY nakwa ekwentị abụọ garara ọnụ.

Enyere aha ndị ahụ ana enyo enyo bu ndi anwụchiri dika, Onoja, Sanusi Muhammed, Kenneth Nwokpu, ebe ha nile bu ụmụ nwoke ma nọrọ na agbata afọ iri abụọ na asaa ya nakwa afọ iri atọ na abụọ.

SP Tochukwu Ikenga gara n’iru mee ka amata na nyocha ka na aga n’iru iji nwuchikọ ndị ọzọ so n’ime otu ndị oji egbe aga ahụ, dika o kwuputara na ndị uweojii na agba mbọ iji chụọ ndị omekome ọsọ ụkwụ eru ala na State ahụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited