Akpola oku udo n’etiti mba Democratic Republic of Congo nakwa mba Rwanda.

Written by on March 19, 2025

Onye isi ala mba Democratic Republic of Congo bu President Felix Tshiekedi nakwa ogbo ya nke mba Rwanda bu President Paul kagame akpola oku iwusagodu ngwa ogu ozugbo na mpaghara Eastern DR Congo dika ha nwechara mkparita ububo na Qatar.

Nkea bu mkparita ububo mbu ndi isi ala abuo a n’ enwe kemgbe mba Rwanda bu ndi na akwado otu ahu n’ ama ochichi mba ahu aka n’ iru bu M23 rebels malitere imegide mpaghara ahu dika ndi ochichi mba ahu mere ka amata na onu ogugu ndi egbugoro egbu di puku asaa n’ onu ogugu kemgbe onwa January.

Odochabeghi anya k’ odi ugbua ma otu M23 aga ekwenyere na atumatu iwusagodu ngwa ogu ahu dika ha juru ibia sonyere na mkparita ububo udo ahu were onodu na Angola unya bu Tuesday.

Mba DR Congo n’ ebo obubo gara mba Rwanda SI na ha ji atumatu izitekwu ndi agha ozo tinyere otu M23 rebels iweta ogbaghara n’ agbanyeghi ndumodu nile otu UN nakwa US nyere .kama na Rwanda goro aka n’ ukwu ya inye nkwado obula gara M23.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited