Akpupula otu nwanyi mba Australia ulo ikpe kwere maka ebubo na otinyere mmadu ato yana ha metutara ihe mgbu na nri ehihie obunyere ha.

Written by on April 30, 2025

Akpupula otu nwanyi mba Australia enyere aha ya dika Erin Patterson ulo ikpe kwere maka ebubo na otinyere mmadu ato yana ha metutara ihe mgbu tinyekwara onye nke nwetara ihe mmeru aru site na nri ehihie obunyere ha.

Ulo ikpe mere ka amata na odoziaku Patterson gbara afo iri ise bunyere ndi obia ya mmadu ano anu otinyere ero,ma ju isonyere ha rie ya kama n’ ojizi obere efere je kute nke ya iche.

Ya bu nwanyi k’ ozi n’ akowa na onoralari na mbu dee ederede n’ owa ozi Facebook n’ akowa akurungwa oji esi ero.

Yabu kowara na obu eziokwu na achoputala na ihe mgbu dina ero ahu ejiri nkwadobe nri ahu kama n’ obu nnukwute onwunwa, maka na onweghi ka yabu nwanyi siri buru n’ obi inye mmadu ihe mmeru aru.

K’ osiladi, odoziaku Patterson ka n’okwa n’ ulo ikpe azara onu ya n’ ebubo ato bu nke metutara igbu mmadu ana ebo ya dika oka n’ ago agugo banyere ya.

Habu mmadu ato nwunyuru anya site n’ ihe mgbu ahu gunyere : Nne na Nna di ya nakwa nwanne Nne di ya nke nwanyi, tinyekwara di nwanne Nne di ya ahu nwetara ihe mmeru aru.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited