Akwa mmiri dara na mba India atala isi mmadu itolu.

Written by on July 9, 2025

Akwa mmiri ahu gbajiri na mpaghara Gujarat State nke mba India tata bu Wednesday abali itolu nke onwa July afor a egbuola opekata mpe ya buru mmadu itolu.

Ndi olu naputa ka no olu ebe ahu dika otutu ugboala dakpunyere na yabu osimmiri.

Onye Minister ulo olu aru Ike mpaghara Gujarat bu Rushikiesh Patal mere ka amata na otutu ugboala dabanyere na osimmiri mahisagar n’ oge ahu otu mpaghara akwa mmiri Gambhira dara n’ ututu tata bu Wednesday.

Nwa amadi a mekwara ka amata n’ obu kemgbe afor 1985 ka aruru yabu akwa mmiri.

Otu onye olu oyibo gbagotere nke oma bu Anil Dhameliya gwara ndi nta akuko na achoputala ozu mmadu itolu nwuru anwu tinyekwara mmadu ise ndi ozo nwetara ihe mmeru aru dika olu nnaputa kana agakwa n’ iru .

Onye prime minister mba ahu bu Narendra modi kowara odachi a dika nnukwute ihe igba anya mmiri ma burukwa ozi iti aka n’ obi gara ezi n’ ulo ndi ahu ndi nke ahu nwugoro anwu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited