Augustine Eguavoen ekwuola n’otu Super Eagles ka nwere ohere itozu oke maka ndị ga-eso sọ iko mba ụwa nke afọ 2026.

Written by on June 24, 2025

Nwa amadi ahụ jibu ọkwa coach nke otu Super Eagles ala anyị bụ Augustine Eguavoen ekwuola sị na ya bụ otu egwuregwu ka nwere ohere imecha tozua oké nke ndị ga-eso sọ iko mba ụwa ga ewere ọnọdụ n’afọ ọzọ bụ 2026.

Nwoke ahụ gbara afọ iri ise na itoolu bụ ya weghara ọnọdụ ọkwa coach nke nchere oge ozugbo Finidi Goerge gbachara arukwaghim.

Eguavoen bụ ya nyere otu Super Eagles aka itozu oke maka asọmpi iko mba Afrịka nke afọ a bụ 2025 tupu a kpọlite Eric Chelle maka ya bụ ọkwa coach.

Otu Super Eagles kana agba ndị anọ na ogo nke World Cup qualifying group.

Ya bụ na ha ka chọrọ ọtụtụ akara point iji tozuo oke ndị ga-eso sọ ya mpi n’afọ ọzọ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited