Blog one column

Page: 19

Otu ụlọrụ Commission e nwere na ọchịchị ndị agha na mba Niger Republic akwadola ka anọkwuo ihe ruru afọ ise ugbua tupu ana enyefe ọkwa ọchịchị obodo ahụ n’aka ndị nkịtị. Ịga echeta na ndị agha akpọrọ military junta nọrọ n’afọ 2023 n’oge ha kwaturu ọchịchị President Mohammed Bazoum were kwuo na ọ bụ naanị […]

Ndị ahịa na Onitsha nke dina Anambra Steeti amalitela ịhụsi anya dịka e mechiri kpamkpam mpaghara ahịa isii na ya bụ ahịa site n’aka ndị ọrụ nchekwa ihe rugoro izu abụọ ka ọ dị ugbu a. Ndị nta akụkọ nwetara ozi na ọtụtụ ụlọ ahịa ka e mechiri emechi site n’aka ndị ọrụ nche bụ […]

Nwa amadi ahu ama ama na olu nta akuko igwe okwu akporo Broadcast Journalist ma buru onye ji Enugu mere onodu bu Johnpaul Anih enwetala nzere mmuta ahu kachasi ukwuu na usoro agum akwukwo mahadum akporo Doctor of Philosophy PhD na ulo akwukwo mahadum Enugu State University of Science and Technology ESUT. Dr Johnpaul Anih […]

Ọnụ na e kwuru ụlọ omebe iwu Anambra Steeti house of assembly bụ Somtochukwu Nkem Udeze ekwuola na ọ wụrụ ya akpata oyi etu nwa amadi anwụchiri maka ogbugbu nke Hon Justice Azuka bụbu onye omebe iwu nke state ahụ siri gbapụ n’ogige ndị uwe ojii ma rie mbọ mbọ ọsọ. Ozi na eru anyị […]

Ụlọrụ n’ahụ maka ọkụ latric n’ala anyị bụ Nigerian electricity distribution company ngalaba ha nke akpọrọ main power electricity distribution company limited akpọla oku ka e mee ngwangwa nye ndị ahụ ntaramahụhụ kwesịrị ha bụ ndị anwụchiri maka ịwakpo akọrọ ngwa ọkụ latric na Enugu state. Ọkpụkpọ oku a bịara n’oge ndị nlekọta nke ụlọrụ […]

Gọọmenti Enugu state yana ụlọrụ nọrọ onwe ya akpọrọ White Rabbit Afro limited agbapela obosara ala ruru ntụ hectare iri abụọ ebe a gana akọputa nri cocoa bụ nke a na-atụ anya na ọ ga-eji ọkpụrụkpụ ego ruru ijeri dollar iri atọ $30 billion were wulite akụnụba nke state a. Onye ji ọkwa Commissioner for […]

Regina Daniel nke na-eme ihe nkiri onyonyo n’otu Nollywood ekposala ọwa ozi Instagram ya dịka na efegharị sị na di ya bụ Ned Nwoko enwetala nwa ọhụrụ site n’aka nwaanyị ọzọ bụ Chika Ike. Okwu akpụ n’ọnụ ka ọ dị ugbu a na ọwa ozi ọgbara ọhụrụ bụ na Chika Ike onye kwupụtara banyere nwa […]

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP na Abịa State amalitela ịrịọ Gov Alex Otti na-achị state ahụ ka ọ laghachi azụ n’otu ahụ ọ nọ bụ na ya. Nkea sitere n’ọnụ onyeisi oche otu board of trustees nke party ahụ bụ Adolphus Wabara. Sen Wabara kwuru na Gov Otti na azọ ụkwụ dị mkpa na ọrụ ndị […]

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party ekwuola na ha enwebeghi mkpebi ọbụla na ọ bụ na mpaghara South East ka ha ga-esi wepụta onye ga a zọro ha ọkwa onyeisi ala nke afọ 2027. Nkea sitere n’ọnụ onye ji ọkwa odeakwụkwọ mgbasa ozi ha n’ala anyị bụ Mr Obiora Ifoh bụ onye gwara ndị nta akụkọ […]

Na Asọmpi egwuregwu bọọlụ dị n’etiti otu egwuregwu Galatasaray yana Rizespor ka Victor Osimhen bụ nwa afọ ala anyị ụkwụ na aghọ nọrọ nye ọkpụ goolu abụọ asatara naanị otu na ama egwuregwu Caykur Didi Stadium n’abalị ụnyaahụ bụ Monday. Osimhen buru ụzọ nye ọkpụ goolu nke mbụ n’oge o mechara nkeji abụọ a malitere […]


Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited