Eweputala atumatu aga eji hazie usoro igba boi n’ ala Igbo.
Written by Onyinye on June 7, 2025
Amalitela itu atumatu aga eji mee ka igba boi nyere umu Igbo buruzie afo asaa zuruoke na Anambra state.
N’ otu aka ahukwa ka ana akowa na nwa afo Igbo obula nwere mmasi igba boi ga aguriri akwukwo n’ ogogo nke primary tupu ome nke a.
Ihe ndi a nile putara ihe n’ atumatu iwu echere n’ iru ulo nzuko omebe iwu Anambra State House of Assembly nke enyere isi okwu ya dika; Anambra state Igbo apprenticeship bill 2024 ma buru nke eweputara ohaneze n’ ogige ulo nzuko ahu di na Awka bu isi Obodo state ahu.
Onye ji okwa speaker ulo nzuko ahu bu Hon Somtochukwu Udeze noro n’ oge ona ogbape ogbako maka inuru onu mmiri okwu ohaneze ahu, me ka amata na emecha binye yabu atumatu aka k’ oburu iwu, na oga enye aka belata olmmegide ma weta usoro doro anya yanakwa iga n’ iru chekwa omenani na onodu akuluba na mpaghara ala Igbo.
Nwa amadi kwadoro yabu atumatu iwu ma burukwa onye omebe iwu n’ anochite ogbonta vote Anaocha constituency 2 bu Hon Ejike okechukwu kowara,na atumatu iwu a ga enyekwa aka gbochie ihe obula bu mmegide n’ udi obula site n’ ihu na akowaputara ma deputa ya n’ akwukwo bu nkwekorita dina etiti nwa boi nakwa oga ya, okachasi oge na etu aga esi nye ya oke nke ya ma ogbacha boi.
Dika nwa amadi a siri kowa, na ihe ndi kacha puta ihe na atumatu iwu a gunyere; igba mbo hu na edere nkwekorita di n’ etiti oga na nwa boi n’ akwukwo, ikewaputa usoro ndebanye aha nyere ndi nile n’ agba boi nakwa ndi oga ha, tinyekwara usoro aga esi n’ edozi ese m okwu obula daputara n’ etiti ha abuo.
Na nke ya ka onye isi oche otu house committee on commerce, trade and industry bu Hon innocent ojike n’ anochite ogbonta vote oyi constituency mere ka amata na atumatu iwu a ga enyekwa kwalite ntukwasi obi ndi n’ ewube ulo olu tinyekwara ime ka usoro esi eme ihe n’ ala anyi akawanye mma ruo n’ ogogo mba uwa.
Otutu ndi onu n’ eru n’ okwu sonyere n’ ogbako a bu ndi gunyere; ndi isi ahia, ndi oga nakwa umu boi ha kenere ulo nzuko omebe iwu ahu maka oweputara ohaneze atumatu di etua ma n’ akowakwa na emecha binye aka ka oburu iwu, na oga enye aka kwalite usoro esi agba boi bu nke zuputagoro otutu ndi mmadu bu ndi n’ eme nke oma na ngalaba azum ahia na Anambra state, n’ obodo anyi a bu Nigeria nakwa n’ uwa nile.
Onye nta akuko anyi bu chukwuma Philips nwetara ozi na yabu atumatu iwu nwekwara ohere maka iguzobe ulo olu akporo Anambra state Igbo apprenticeship commission nke olu ha bu inye onye obula gbara boi asambodo ma oburu na onozuo ofor ole yana oga ya nwere nkwekorita.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.