Governor Charles Chukwuma Soludo agbapela atumatu ohuru akporo Solution Lens maka ezi usoro ochichi nyere ohaneze.
Written by Onyinye on May 17, 2025
Aka n’ achi Anambra state bu governor Charles Chukwuma Soludo agbapela usoro agbara ohuru okporo Solution Lens, bu usoro aga esite n’ owa ozi agba ya n’ anwu ma n’ akowaputara ohaneze etu usoro ochichi si aga na state ahu.
Atumatu a bu otu n’ ime usoro aka n’ achi state ahu ji n’ aka iji kwalitekwuo imepe usoro ochichi anya oghere, Ina agbasara umu afo state ahu ozi banyere atumatu nakwa olu ngo govt state ahu ji n’ aka, tinyekwara usoro ha ga eji n’ eme nkpesa banyere onodu obula ma n’ ajukwa ajuju etu ihe si aga.
Site na nkwado nke ulo olu state ministry of budget and economic planning,na njiko aka hana ulo olu ministry of information nakwa nke Anambra state ICT agency, k’ ozi n’ akowa n’ obu ndi enyere ezigbo ozuzu nakwa ndi onu n’ eru n’ okwu ka ahoputara ga n’ ahu maka atumatu a bu Solution Lens iji n’ enwete ozi ma n’ amatakwa ka ihe si aga.
N’ oge ana agbape atumatu a,ka governor Soludo nke onye nochitere anya ya bu commissioner for budget and economic planning bu odoziaku chiamaka Nneka, rioro ulo olu mgbasa ozi nakwa nke otu civil society organizations, ka ha gba mbo ime ka ohaneze mata ma nweta ohere na usoro ohuru a.
Odoziaku Nneka kowara na usoro a bu iji me ka ndi ana achi n’ esonyere nke oma n’ usoro ochichi ma n’ emekwa ka govt mata etu ihe si aga na mpaghara di iche iche.
Okowara na ohere a bu maka onye obula,ma ndi bi n’ ime Obodo, umu akwukwo,otu kwuru n’ onwe ha, nakwa ndi nta akuko.
Na nke ya ka commissioner n’ ahu maka mgbasa ozi na state ahu bu Dr.Law Mefor, noro kowa na usoro a n’ egosi uchu governor Soludo di ibagide usoro digital maka ezi ochichi nyere ohaneze.tinyekwara atumatu nke oji azu ndi olu oyibo ibanye n’ usoro nke digital.
N’ otu aka ahukwa ka onye ji okwa chief executive nke ulo olu Anambra state ICT agency bu Mazi Chukwuemeka Fred Agbata nakwa Prince Chris Azor,bu coordinator Anambra state civil society network and co- chair of the open governance partnership ( OGP) toro governor Soludo maka ezi atumatu a oweputara iji gba ya n’ anwu bu usoro ochichi state ahu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.