Govt mba United Kingdom ekwela nkwa si na aga arunye ebe nkiri anya mbu ahu di na mba Europe na mba UK.

Written by on April 9, 2025

Govt mba United Kingdom ekwela nkwa si na aga arunye ebe nkiri anya mbu ahu di na mba Europe na mba UK.

Omere ka amata na ebe aga aru ya bu n’ ala onye former kempston Hardwick brickwork didebere Bedford ma buru nke ana atu anya n’ oga ekewaputara mmadu ruru puke iri abuo na asato ohere olu tupu emepe ya n’ afo 2031.

Yabu ebe nkiri akporo Universal theme park bu nke ruru mpaghara nari ano na iri asaa na isii ka ana akowa na oga adota ndi obia ruru nde asato na uma ise n’ afo nke mbu ya.

Ulo olu universal destination and experience mere ka amata na percent iri asaa na ndi aga ewe olu n’ ebe ahu ga abu umu afo mba Bedford na ndi bi na gburu gburu ha.

Ulo olu a mekwara ka amata na ebe nkiri a ana arunye na mpaghara Bedford ga abu otu n’ ime ndi kacha buo ibu ma buru nke agbara ohuru n’ uwa nile ma arucha ya.

Onye ji okwa ode akwukwo ihe banyere omenala na mba UK bu Lisa Nandy kenere govt mba ahu maka ezi atumatu a oweputara maka ikwalite onodu akuluba mba ahu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Subscribe

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited