Imirikiti ndị mmadụ kariri otu puku bụ ndị gbara ọsọ ọgụ na ọgba aghara na-ada na ọwụwa anyanwụ mba Democratic Republic of Congo agbagala na mba Burundi Ịga zọro ndụ ha.

Written by on February 21, 2025

Imirikiti ndị mmadụ kariri otu puku bụ ndị gbara ọsọ ọgụ na ọgba aghara na-ada na ọwụwa anyanwụ mba Democratic Republic of Congo agbagala na mba Burundi Ịga zọro ndụ ha.

Dịka ụlọrụ mba ụwa akpọrọ United Nations refugee agency siri kwupụta, ndị ruru puku mmadụ iri agafela oke ala obodo abụọ ahụ were mibanye na mba Burundi iji gbanahụ ọnwụ ike ha.

Ọtụtụ n’ime ndị ahụ ka e kwuru na ha bucha ụmụ afọ mba Congo ọ kachasị ndị ahụ sitere na mpaghara Bukavu nke dina ndịda ugwu nke Kivu province bụ ebe ọnọdụ kawanyegoro njọ n’ime abalị ole na ole gara aga.

Ebe ụfọdụ n’ime ndị ahụ n’agba ọsọ ọgụ ka e kwuru na ha bụ ụmụ afọ mba Burundi jiri nwayọọ lọghachi azụ n’ụlọ ha.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies