Ndi Akpobi Ndorondoro Akusuola Peter Obi Na Benue State

Written by on September 8, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi ana enyoenyo na ha bu ndi akpobi tika zogbuo na udi amara dika thugs anorola taata bu Tuesday nochie onye ahu ji okoloto otu ndorondoro Nigeria Democratic Congress NDC azo okwa onye isi ala na ntule aka ochichi afo 2027 bu mazi Peter Obi.

Nke a ka ozi kowara na omere na mpaghara okporo uzo Boko road dina Benue State oge yabu onye jiburu okwa Governor Anambra State ji igwe ugboala njem ya akporo Convoy cho ibanye yabu Benue State.

Habu ndi tika zogbuo jicha osisa ka ndi nta akuko kowara na ha nochiri yabu okporo uzo igbochi igwe ugboala njem yabu onye NDC Presidential Candidate iga na iru.

Na okwu ya megide nke a ka mazi Peter Obi kowara ya dika nke ana agaghi anagide bu yabu nkusu, ma boo ebubo na obu ndi ntorobia Governor State ahu bu Rev Fr Hyacinth Alia kwadoro mere nke a.

Ka osiladi, ndi nta akuko a wetara ozi na ihe niile banyere onodu a nakwa ihe kpatara agwa ojo habu ndi tika zogbuo aka aputachabeghi ihe na oge ndeko akuko a na ehihe taata.

Ozi kowaziri na Peter Obi wuchiri Benue State taata na njem mgbaru gaara ndi obodo ometutara bu nkusu anoro na odi nso a kwafusie obara ndi mmadu na State ahu.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited