Odachi Ihe Mberede Okporo Uzo Atala Isi Onye Nigeria Customs Na Cross River State
Written by admin on September 8, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu onye olu ulo olu Nigeria Customs Service enyere aha ya dika Prince Etteng Ise ezutela onwu ike ya na ihe mberede okporo uzo mere ohuru na Cross River State.
Na okwu ya taata bu Tuesday na Calabar bu isi obodo State ahu site na ozi onyefere ndi nta akuko ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na yabu Cross River State bu SP Sunday Eitokpah mere ka amata na obu unya bu Monday ka odachi a mere.
SP Eitokpah kowara na yabu ihe mberede mere na okporo uzo sitere Ikom gawa Calabar, kpomkwem na mpaghara ya didebere imime obodo Alesi village nke Ikom LGA.
Yabu onye Customs Officer na aru na mpaghara Mfum Border nke Etung LGA na State ahu ka akowara na ogbanariri onwe ya na njikwanata oge ochoro izere olulu mmebi okporo uzo amara dika pothole oge odachi a mere ma napu ya ndu ya na ike.
Na ozi a ka yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Cross River State kowaziri na ugboala yabu onye Customs Officer gbaghapuru okporo uzo oge ona ezere olulu mmebi ahu ma banye na ime ohia, buzi ebe ogara kukanye na osisi.
