Aston Villa Egotela Nwa Afo Mba Senegal Ukwu Na Agho Nko Na Otu Egwuregwu PSG
Written by admin on September 1, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu egwu ball Aston Villa nke English Premier League ebinyela aka ojiri gote nwa afo mba Senegal na agbara otu egwuregwu Paris Saint Germain PSG nke mba France bu Ibrahim Mbaye.
Mbaye ka ozi mere ka amata na Aston Villa gotere ya na onu ego di nde Dollar iri isii na ato ma buru ngote were onodu na ozuzu oke ya taata bu Tuesday.
Yabu nwa afo mba Senegal egotere ohuru ka akowara na onoro na oge season gara aga sonyere PSG na asompi iri ato na otu, otu egwuregwu ahu gbachara, ebe ha mechara noro turu ugo na iko Champions League nakwa nke French League 1.
Yabu nwokorobia gbara afo iri na asato ka ozi a gara na iru kowa na osonyere mba Senegal ugboro ano na asompi iko mba uwa were onodu na odi nso a na mba United States of America, Mexico nakwa Canada.
Onokwara oge ahu nyeta okpu goal mba Senegal megide mba France ma buru nke mere ya onye kachasi mee obere nwokorobia sitere ala isi oji Africa na enyeta okpu goal na iko mba uwa.
