Israel Agala Na Iru Isu Otutu Ndi Isi Ochichi Iran Akwu Nke Onwu Ike

Written by on March 19, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Mba Israel agala na iru na ibi aka ojo sitere na agha ahu ojikoro aka yana mba United States of America ebu na mba Iran nke mejuputara na ndi okpukpere uka Islam.

Nke a bu dika yabu mba Israel noro na ubochi Wednesday napu Minister oje na mmuo na okwa Intelligence Minister mba Iran bu Esmail Khatib ndu ya na ike.

Ndi agha Israeli Defence Forces gakwara na iru gbuo otutu ndi ozo welitere isi sitere yabu ulo olu Ministry oje na mmuo.

Ihe ndi a putara ihe unya site na okwu Minister mba Israel na ahu maka ndi agha bu mazi Israel Katz gwara ndi nta akuko.

Na aka nke ya ka onye isi ala mba Iran bu President Masoud Pezeshkian mere ka amata na obu eziokwu bu ogbugbu mba Israel gburu yabu Minister nakwa ndi ozo.

President Pezeshkian kowara na obu agwa ekperima agha nkusu mba Israel ji ngwa ogu missile nakwa drone mee na Iran ka ha noro gbuo ndi a.

Onuru iyi agha mmekwanata megide mba Israel.

Nke a na abia dika habu ndi agha mba Israel buru uzo noro na ubochi Tuesday buo agha ma gbuo ochi agha izugbe yabu mba Iran bu Ali Larijani nakwa oji agha nke oyiri ndi agha paramilitary mba ahu amara dika Basij paramilitary force.

Ka osiladi, ndi agha mba Iran noro na aka nke ha na abali putara Wednesday buo agha mmekwanata na isi obodo mba Israel bu Tel Aviv nakwa na mpaghara ebe ahu Israel napuru na West Bank ma gbuo mmadu ano.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited