Lionel Messi esonyerela ọgbọ ya ụmụ afọ mba Argentina malite ọzụzụ maka asọmpi eji etozu oke ndị ga eso sọ iko mba ụwa.
Written by Onyinye on June 5, 2025
Nwa afọ mba Argentina ahụ ama ama n’ihe banyere egwuregwu bọọlụ bụ Lionel Messi alọghachila azụ na ama egwuregwu n’ụbọchị Monday gara aga iji sonyere ogbo ya na mba ahụ gaa ọzụzụ.
Ọ lọghachiri azụ ka o mechara ihe ruru ọnwa asaa ọ gara ị nara ọgwụgwọ kworo ihe mmerụ ahụ nke o nwetara.
Na ya asọmpi eji etozu oke ndị ga eso sọ iko mba ụwa ka e kwuru na mba Argentina ga anọrọ taa bụ Thursday zute ogbo ha sitere na mba Chile tupu hana mba Colombia achụpụ ya n’abalị iri n’otu nke ọnwa June anyị nọ n’ime ya.
Mba Argentina bụ ha ka nku ha kacha dị elu na mba ndị enwere na mpaghara South America site na akara point iti atọ n’otu.
Nwa amadi ahụ gbara afọ iri atọ na asaa ka e kwuru na nlọghachi azụ ya n’otu egwuregwu ga eweta ihe dị iche nyere mba Argentina n’ebe o metụtara itozu oke ha maka ya bụ asọmpi.