Mazi Peter Obi akatola ihe okowara dika usoro ochichi azum ahia ana ahuta n’ ala anyi a.
Written by Onyinye on April 26, 2025
Nwa amadi ahu ji okoloto otu ndorondoro Labour party zoo okwa onye isi ala Nigeria bu Mazi Peter Obi egosiputala etu osi emetuta ya bu usoro ochichi azum ahia n’ ari elu orji n’ ala anyi a ma n’ ado aka na nti si n’ usoro di etu a n’ ebi aka ojo n’ usoro ochichi onye kwuo Uche n’ ala anyi a.
N’ okwu ya n’ ogbako ha nwere na mahadum johns Hopkins University dina Washington DC ka obi noro kowa usoro ochichi azum ahia a n’ eko achicha dika atumatu nke ana ebo obubo na ndi okwe ndorondoro n’ adi kwuo umu n’ eto eto ugwo ka ha ga n’ ekwugide ezi ochichi ndi otu ha okachasi n’ usoro owa ozi.
Ozi ndi nta akuko nwetara site n’ ihe onyonyo n’ egosi ebe Mazi Peter Obi noro n’ akatosi ya Ike dika ngharipu nke ndi ochichi n’ ilokota umu n’ eto eto.
K’ osiladi, obi gaziri n’ iru kpo oku gara ndi ntorobia ala anyi ka ha muru anya dika azu ma gharakwa ikwe ka ejiri ka dika akurungwa eji etisa ochichi dika okowara na mmepe Obodo n’ abia nani mgbe umu afo ala ahu mepere onu kpo oku ezi nkowa usoro ochichi site n’ aka ndi ochichi ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.