Mazi Peter Obi nke otu Labour Party ekwuola sina enweghị ihe dịka ọchịchị onye kwuo uche ya ma ọ bụ nke egbe bere ka ugo bere n’ala anyị bụ Nigeria.

Written by on March 21, 2025

Nwa amadi ahụ ji ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ Labour Party were zọo ọkwa onyeisi ala n’afọ 2023 bụ Mazi Peter Obi akwala arịrị ma gbaruo ihu ihe kpatara ndị omebe ụlọ nzukọ ogo etiti jiri nyere nkwado ha na ọnọdụ gbata gbata nke onyeisi ala kwupụtara nyere ọchịchị Rivers State.

Obi kwuru na ntụliaka ahụ nke ndị omebe iwu ahụ nọrọ ụnyaahụ nye nkwado ha egosila na ọchịchị onye kwuo uche ya dịka esi eme na mba nwa onye ọcha adịghị n’ala anyị bụ Nigeria ma ọlị.

Ya bụ aka chiburu Anambra Steeti site na ọwa ozi ya na X were kwuo sina ọchịchị egbe bere ka ugo bere agaghị agbanwu mgbọrọgwụ n’obodo ana asị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ na anọghị na gọọmenti taa kpuchie ọnụ.

Okwu nwa amadi a na-abịa ngwa ngwa ụlọ nnọchiteanya house of representatives buchara ụzọ nye nkwado ha maka ya bụ amụma state of emergency n’agbanyeghị etu ụmụ afọ ala anyị si were na akato ya bụ amụma n’ebe ọ dị elu.

Ogbo ha bụ ụlọ nzukọ ukwu Senate ka e kwuru na ha mechakwara donyere onyeisi ala ukwu n’aka nke ha.

Peter Obi kwuru na ihe fọrọ n’ala anyị abụghịzi ezigbo ọchịchị ọha karase kama na ọ bụ ihe dịka aga asị na ọ bụ ndị ekperima biakoro ọnụ ma na-enwe nghọta n’ime onwe ha.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited