Mba Israel Akwala Nkwa Onwu Ohuru Na Mba Lebanon
Written by admin on March 12, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ndi agha mba Israel agala na iru na agha hana ebu emegide mba Lebanon dika osiri di na nkusu ohuru ha megara isi obodo mba ahu bu Beirut.
Nkusu a were onodu na agbata abali gara aga puta ututu taata bu Thursday na ndida ugwu mba Lebanon ka ndi agha Israeli Defence Forces IDF noro gbuo opekata mpe mmadu asaa.
Ozi kowara na nkusu mba Israel megide Lebanon enyela opekata mpe mmadu di puku nari asato oso na bee ha, ha aghoro ndi na enweghizi ebe obibi.
Na nkusu ohuru a eji otutu ogbunigwe mee ka ozi kowara na oke uda habu ogbunigwe wetara ajo onodu amaghi kwuru na isi obodo mba Lebanon ebe anwuru oku sitere na ogbunigwe ndi agha mba Israel kpochisiri urukpu igwe na Beirut.
Ka osiladi, ozi a kowakwara na ndi isi ekwe onwu Hezbollah nona yabu mba Lebanon mechara jiko aka hana mba Iran buru agha nkusu wuchie mba Israel taata dika agha mmekwanata megide nke ahu Israeli Defence Forces buru uzo buo.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.