Mba Israel egbuola opekata mpe ya buru mmadu asato bu umu afo mba Palestine n’ agha mwakpo ha buru banye n’ ulo ndi nta akuko n’ abali unya
Written by Onyinye on May 28, 2025
Opekata mpe ya buru mmadu asato ka egburu n’ Ike n’ agha mba Israel buru banye n’ ulo ndi nta akuko dina Osama al- Arbid nke mpaghara northern Gaza tinyekwara opekata mpe mmadu iri na ise bu ndi nke nwugoro anwu na mpaghara ahu kemgbe abali unya.
Umu afo Palestine ato ka egburu ebe mmadu iri ano na isii nwetara ihe mmeru aru oge ndi agha mba Israel turu ogbu n’ igwe n’ ebe igwe mmadu gbakoro bu ndi nke gbara oso ize ndu gbaga n’ ogige ebe enye m aka nke Gaza humanitarian foundation.
Mba Israel nakwa United States gaziri n’ iru ikato otu enyemaka ahu ma n’ akowa na ha si n’ ebutere ndi mmadu onwu Ike.
Iga echeta n’ ogbaghara ahu n’ ada n’ etiti mba Israel nakwa mpaghara Gaza’s strip dika ulo olu aru Ike mpaghara Gaza siri kowa, egbugo opekata mpe ya buru umu afo mba Palestine di puku iri ise na ano, na iri ise na isii ebe ndi nke di otu nari puku na iri abuo na ato na otu nari na iri abuo na itolu nwetara ihe mmeru aru.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.