Mba Somalia amachiela onye ọbụla ji akwụkwọ Njirimara nwa afọ mba Taiwan ịbata n’obodo ha ọzọ.

Written by on May 1, 2025

Mba Somalia anọrọla ụnyaahụ bụ ụbọchị ikpeazụ n’ọnwa April were machie onye ọ bụla ji akara Njirimara nwa afọ mba Taiwan ịbata n’obodo ha ọzọ.

Nkea sitere n’ọnụ ministry n’ahụ maka ihe ndị na-eme na mba ọzọ nyere mba Taiwan bụ ndị boro mba China ebubo si na ọ bụ ha manyere mba ahụ nọ na ọwụwa anyanwụ ala ndị isi ojii Ị wepụta ya bụ amụma.

Ha kwuru na mba Somalia emela ka ha mata maka ya bụ mmachi ọhụrụ bụ nke ha kwuru na ọ malitere ịdị ire ụnyaahụ bụ Wednesday.

Mba Somalia kwuru na nzọụkwụ ahụ bụ kworo maka ezi ụdọ mmekọrịta bịara dị n’etiti mba Taiwan yana otu mpaghara kewapụrụ onwe ha na mba Somalia n’afọ 1991 má kwuo na ha abụrụla obodo nwere onwe ha. Mana ya bụ mpaghara ka e kwuru n’ọtụtụ mba ụwa ahutabeghi ya dịka obodo kwụrụ onwe ya. Mana hana mba Taiwan abiala bụru nnu na mmanụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited