Mba Uganda akwụsịla mmekọrịta ọbụla jikọrọ hana mba Germany n’ebe o metụtara enyemaka nke ndị agha.

Written by on May 26, 2025

Mba Uganda akwụsịla enyemaka ndị agha ọbụla sitere na mba Germany na abịara obodo ha dịka ha boro onye nnọchiteanya mba Germany n’obodo ha bụ Ambassador Mathias Shauer ebubo ikwado otu na ama gọọmenti mba Uganda.

Nkea sitere n’aka ụlọrụ Uganda People’s Defence Force.

Mba Germany bụ ndị na enwebeghi ihe ọbụla ha kwuru banyere mkpebi ahụ ka e mere ka amata na ha anọrọla kemgbe ọtụtụ afọ ndị gara aga na akwado mba Uganda na ọtụtụ ụzọ n’ebe o metụtara ndị agha. Ebe azụmahịa obodo abụọ ahụ nọrọ n’afọ 2023 gbagoo ọkpụrụkpụ ego dị narị nde dollar atọ na iri atọ na ise.

Ya bụ ọnọdụ emela ka onye ọbụla na mba ahụ chịrị uche n’aka dịka mba Uganda ga anọrọ n’afọ ọzọ bụ 2026 chịkọba ntụli aka ha ga-eji họpụta onyeisi ala ọhụrụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited