Mba Zimbabwe enwela mkpebi ikachapu ego ndobiri utu isi akuru ngwa ahia niile esitere mba United States of America.
Written by Onyinye on April 7, 2025
Mba Zimbabwe enwela mkpebi ikachapu ego ndobiri utu isi akuru ngwa ahia niile esitere mba United States of America tubata mba ahu iji nye aka kwalite ezi udo mmekorita na habu mba abuo.
Nke a putara ihe na Harare bu isi obodo yabu mba Zimbabwe site na onu onye isi ala mba ahu bu President Emmerson Mnangagwa na okwu ogwara ohaneze banyere onodu ego ndobiri utu isi akuru ngwa ahia ebubatara mba ahu na udi nwa bekee kporo tariffs on imported goods.
President Mnangagwa kowara na nke a bu iji kwalite udo mmekorita na etiti yana ogbo ya nke onye isi ala mba America bu President Donald Trump.
Atumatu a na abia dika ogasiri abali onemone President Trump kwuputara ntarama ahuhu mbugo ego ndobiri utu isi akuru ngwa ahia sitere mba ndi ozo abanye mba America.
Donald Trump noro na izu uka gara aga oge ona ekwuputa nke a mee ka amata na mba Zimbabwe aburugo mba oji per cent iri na asato bugoro ego ndobiri utu isi akuru ngwa ahia si ebe ahu abata America.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.