Mmadụ ise ana enyo enyo na ha bu ndi ntọri bu ndi na akpa ike ọjọ ezutala ọnwụ ha n’aka ndị uweojii na Delta State.
Written by Onyinye on April 29, 2025
Mmadụ ise ana enyo enyo na ha bu ndi ntọri bu ndi na akpa ike ọjọ na Ubulu-Uku, Issele-Uku, Issele-Asagba nakwa gburugburu ya ezutala ọnwụ ha n’aka ndị uweojii na Delta State.
Nkea putara ihe ụnya bu Sunday site n’aka onye mmekọrịta ohaneze nyere ndị uweojii na State ahụ bu SP Bright Edafe.
N’okwụ ya, Edafe kọwara na site na amamihe ndị uweojii nakwa nyocha ha, ha wakporo otu ebe ndị ntọri ahụ ji mere ọnọdụ na Agu-Amawbia forest, na Anambra State bu ebe ha nwetara otu AK-47 rifle nakwa 132 rounds of live ammunition.
Ha gara n’iru na nyocha ha ga n’ebe ọzọ ha jikwa mere ọnọdụ n’ohia dị na etiti Issele-Asagba nakwa Otulu, ebe Bellow Abubakar nakwa ndị otu ya na eche iwakpo ha n’ike.
N’oge ndị uweojii ahụ rutara ebe ahụ, ha malitere zowa mgbo egbe ka mmiri dika ndị ntọri ahụ riri mbombo ọsọ kwere maka etu ndị uweojii ahụ siri alụso ha ọgọ.
Mmadụ ise ahụ tinyekwara Bellow Abubakar bu onye na enweghi ike gba ọsọ kwere maka ọtụtụ mgbo egbe bara ya ahụ bu ndi akpọgara n’ụlọ ọgwụ mana onye dọkịta mere ka amata na ha aburula ndị zụtere ọnwụ ha.
Edafe kọwara na ha nwetakwara AK-47 rifle ọzọ, nakwa 18 rounds of 7.62mm ammunition na ọhịa ahụ, ebe nyocha ka na aga n’iru maka inwuchi ndị nke ahụ nwetara ihe mmerụ ahụ ma rie mbọmbọ ọsọ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.