Ndị agha ala anyi ewegharala obi govt Rivers State dina Port Harcourt bu isi obodo State ahu.

Written by on March 20, 2025

Ndị agha ala anyi anorola taa bu Wednesday gaa weghara obi govt Rivers State dina Port Harcourt bu isi obodo State ahu.

Nke a na abia dika ogasiri elekere ole na ole onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu nochara na abali unya bu Tuesday kwuputa ajo onodu gbatagbata megide ochichi State ahu dina aka Gov Siminalayi Fubara.

Na ututu taata ka ndi nta akuko hutara na ndi agha buu ugboala Armoured Personnel Carrier nochie onu uzo ama obi govt State ahu dina ogologo okporo uzo Nnamdi Azikiwe Road nke Port Harcourt.

Nke a na eme dika otutu ndi gunyere: onye ahu ji okoloto otu ndorondoro Labour Party zoo okwa onye isi ala bu Mazi Peter Obi, otu South South Leaders nakwa ogbo ya nke otu Pan Niger Delta Forum PANDEF gunyekwara otutu ndi ozo noro na nkwuwa okwu ha kato etu President Tinubu siri kwuputa onodu gbatagbata na ochichi yabu Rivers State.

Na otu aka ahukwa ka govt etiti noro taata site na onu okaiwu izugbe ochichi etiti ala anyi na okwa Attorney General of the Federation ma burukwa Minister ikpe nkwumoto bu Chief Lateef Fagbemi SAN kwuputa na agana enyefezi ego nketa kwa onwa akporo Monthly Allocation nke Rivers State ejichipuru ejichi na aka onye ahu President Tinubu kpolitere ohuru na okwa Sole Administrator State ahu bu Retd Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas maka ezi onodu siriri werere olu ya.

Ulo nzuko ukwu Senate nokwara taata kowa na onatago akwukwo ozi onye isi ala anyi zitere ya maka ajo onodu gbatagbata ahu okwuputara na Rivers State.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited