Ndi Obodo ogbede na Igbo -etiti LGA nke Enugu State emela ngaghari udo megide nkwatu ulo ahia ha n’ mpaghara ahu.
Written by Onyinye on July 18, 2025
Otutu ndi n’ azu ahia “ji”na nkwo Ogbede dina Igbo-etiti East LGA nke Enugu State anorola unya bu Wednesday me ngaghari udo ga n’ obi govt state a nakwa n’ ulo nzuko omebe iwu di n’ isi Obodo Enugu.
Habu ndi ngaghari udo mejuputara na umu nwanyi ajadu n’ ario ka enye ha ikpe nkwum oto nakwa iti aka n’ obi banyere nkwatu nke onye isi okpuru ochichi ahu bu Dr Eric Odoh kwatusiri ulo ahia ha.
Habu ndi ngaghari udo nke onye ndu ha bu Mazi Ezeoyiri Longinus jigasi obosara akwukwo placards ,guru egwu ga n’ n’ obi govt state a nakwa n’ ulo nzuko omebe iwu n’ ebo obubo si, na onye isi oche okpuru ochichi ime Obodo ahu nyere ntuziaka ejiri kwatuo ulo ahia ndi otu ha di otu nari n’ onu ogugu na ngwucha onwa February n’ eziteghiri ha ozi mgba ama ma obukwanu nye ha ihe iti aka n’ obi.
Ha okpokuziri aka n’ achi state a bu Governor Peter Mbah nakwa ulo nzuko omebe iwu state a,ka ha gbatara ha oso enye m aka ma nye yabu onye isi oche okpuru ochichi ntuziaka ka okwusi ibughari ebe ha n’ azu ahia kama ka oruzighariala ha ulo ahia ndi nke okwaturu ma obukwanu onye ha ihe iti aka n’ obi.
N’ oge akpoturu yabu onye isi oche okpuru ochichi ime Obodo bu Dr Odoh unya bu Wednesday,ka onoro kowa si na yabu nkwatusi bu eziokwu kama n’ obu iji dozigharia ahia Obodo ahu n’ udi ogbara ohuru.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.