Ndị okpukperechi ụka Islam n’ụwa niile amalitela ịgbako n’obodo mecca nke dị na mba Saudi Arabia mama mmemme one n’afọ ha akpọrọ pilgrimage.
Written by Onyinye on June 5, 2025
Ndị okpukperechi ụka Islam amara dịka Muslims amalitela ịgbako n’obodo Mecca nke dị na mba Saudi Arabia maka emume Haji bụ otu n’ime mmemme ise ji okpukperechi ụka Islam.
N’ime abalị ole na ole na abịa na ka ha ga amalite ịchụàjà yana emume ndị ọzọ e kwuru na ọ malitere kemgbe otu puku na narị afọ anọ gara aga.
N’oge ahụ ka e kwuru na ha ga amalite ileba anya na ndị ahụ na abiawa mmemme ahụ n’ụzọ mkpuke iji belata oke okpomọkụ bụ nke tara isi ndị mmadụ dị otu puku na narị atọ n’afọ gara aga. Ebe mba Saudi Arabia tinyegoro ọkpụrụkpụ ego ruru ijeri dollars iji chekwaa ndụ ndị mmadụ n’oge mmemme nke afọ a.
Na iji mee ka nke afọ a kawanye mma, ha amachiela ụmụaka ndị na erubeghị afọ iri na abụọ isonye na emume Haji.
Njem ala nsọ ahụ akpọrọ pilgrimage ka e kwuru na ọ bụ otu ihe na abịa otu ugboro na ndụ onye otu Muslims ọbụla bụ onye nwere ike na ego ọ ga eji ruo ala nsọ ahụ bụ ebe a mụrụ onye amụma ha bụ Prophet Mohammed.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.