Ndi Oluo Otunye Isi Agbagbuola Ndi Uwe Oji Mmadu Abuo Na Anambra State

Written by on September 16, 2024

Ndi oji egbe eri ana amaghi ndi ha bu anorola taata bu Monday wakpo ogige isi ulo olu ndi uwe oji Umunze Divisional Police Headquarters nke Orumba South LGA na Anambra State ma napu ndi uwe oji mmadu abuo ndu ha n’ ike.

Odachi a n’ abia taata dika ogasiri naani izu uka abuo ndi isi ekwe onwu ji ogbunigwe petrol bombs wakpo ma kpa ike ojo n’ ogige isi ulo olu ndi uwe oji Divisional Police Headquarters dina Oba nke Idemili South LGA na State ahu.

N’ okwu ya ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Anambra State bu SP Tochukwu Ikenga mere ka amata n’ anaputago ozu habu ndi uwe oji mmadu abuo ma buga ha oba nyekwa ozu.

Sp Ikenga kowara n’ achoputara ogbunigwe nke ahu amara dika Improvised Explosive Devices IEDs di ise nke n’ agbawabeghi n’ ogige isi ulo olu ndi uwe oji ahu, dika okowara n’ ezigala ndi nchekwa ejikoro onu ichu oku di egwu achiso ndi ala adighi mma ahu.

Ogwara ndi nta akuko na Commissioner ndi uwe oji ala anyi na State ahu bu CP Nnaghe Obono Itam ejirila ukwu ya mega njem nleta n’ ogige ahu odachi a mere, ebe onoro yoo ohaneze ndi nwere ozi di mkpa maka mnwuchiko ndi isiekweonwu ahu ka ha wetara ya ndi uwe oji.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies