Ndị otu ECOWAS ekwuputala obi nwute ha banyere ọnwụ Late Former President Muhammadu Buhari.
Written by Onyinye on July 14, 2025
Ndị otu Economic Community of West African States ECOWAS, na eri ụjọ banyere ọnwụ nwa amadi ahụ jitọpụrụ ọkwa onye isi ala anyi bu Nigeria bu Late Formal President Muhammadu Buhari bu onye nwụrụ na London ụnya bu Sunday.
Onye isi otu ECOWAS bu Dr. Omar Touray, weputara ozi nkasi obi n’aha ndị otu ECOWAS banyere ọnwụ Late Former President Muhammadu Buhari gara ezinụlọ ya, onye isi ala anyi a bu President Bola Ahmed Tinubu, nakwa ụmụ afọ ala anyi bu Nigeria n’izugbe ya taata bu Monday.
O kwuru na otu ECOWAS agaghị echefu Late Formal President Muhammadu Buhari, ebe ọ kọwara Late President Buhari dika onye gbara mbọ nke ukwuu gbasara ọchịchị onye kwuo uche ya, udo nakwa ịdị n’otu na mba West Africa nakwa mba Africa nile gba gburugburu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.