Ndị ụlọ ọrụ West African Examination Council, Nigeria, akachapula ya kpamkpam bu ozi ahụ n’efeghari n’uwa ozi na ha kagburu ule nke afọ a bu 2025.
Written by Onyinye on July 21, 2025
Ndị ụlọ ọrụ West African Examination Council WAEC, Nigeria, akachapula ya kpamkpam bu ozi ahụ n’efeghari n’uwa ozi bu nke boro ebubo na ha kagburu ule West African Senior School Certificate Examination nke afọ a bu 2025, ha kọwara ozi ahụ dika ozi na edughie ụzọ ma buru ọrụ aka ndị ọjọ.
Ozi ahụ malitere feghariya n’ụwa ozi n’ụbọchi Saturday abalị iri na itolu n’ọnwa July afọ a anyi nọ n’ime ya, ma bụrụ nke na ebo ebubo na Ministry n’ahụ maka agụmakwụkwọ na ala anyi a nakwa ụlọ ọrụ WAEC jikọrọ aka ọnụ kagbuo ule WASSCE nile emere n’afọ a bu 2025, kwere maka ntapụ ule, iweputa akwụkwọ ajụjụ yana ịkesa akurungwa ule.
N’ozi putara ihe ụnya bu Sunday bu nke onye nọ ọnọdụ dika Head of Public Affairs bu Moyosola Adesina binyere aka na ya, kọwara na ụlọ ọrụ WAEC mere ka amata na onweghi mgbe ha jiri weputa ụdịrị ozi ahụ, na akagbughi ule WASSCE ọbula.
Ụlọ ọrụ ahụ gakwara n’iru mee ka amata na emechala akara ule ahụ, ma kwe ọhaneze nakwa na aga ewepụta nsonaazụ ya na ma ọ bụ tupu ụbọchị Thursday abalị anọ n’ọnwa August afọ a bu 2025.
Dika ha rịọrọ ndị ọnụ n’eru n’okwu nakwa ọhaneze ka ha wepu uche n’ozi ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.