Ndi uwe oji ala anyi na Delta state anwuchiela ihe kariri mmadu asato ana enyo enyo maka ntoli ma naputakwa ha otutu ihe ndi ozo.
Written by Onyinye on May 17, 2025
Ndi uwe oji ala anyi na Delta state anwuchiela ihe kariri mmadu asato ana enyo enyo maka ntoli ma naputakwa ha nde naira ano(4 million )bu nke ha natachara n’ isi ndi ha toro.
N’ oge ana akpuga ha n’ isi ulo olu ndi uwe oji di na Asaba bu isi Obodo Delta state unya bu Thursday, ka commissioner ndi uwe oji na state ahu bu CP Olufemi Abaniwonda noro me ka amata na ndi uwe oji state ahu n’ agbasi mbo Ike ihu na ekpochapuru ajo agwa ntori ma nwuchie ka ha ra bu ndi nile n’ ebute ogbaghara na Delta state.
CP Abaniwonda mekwara ka amata na ndi uwe oji nwuchikwara otu onye ozo ana enyo enyo maka ntoli ma naputa ya otu egbe AK 47 rifle, puku naira iri itolu(900,000) onatachara nakwa otutu ihe ndi ozo.
K’ osiladi, CP olufemi gakwara n’ iru kwuputa mnwuchi anwuchiri otu onye ozo napuru nwanyi nwa ya di nani onwa abuo na mpaghara warri ma naputa yabu nwata nyefe onye muru ya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.