Ndi uwe oji ala anyi na Oyo State emela ka amata na ha anwuchiela onye otu ha ahu mgbo egbe ya gburu otu nwata akwukwo gbara naani afo iri na ano.
Written by Onyinye on May 22, 2025
Ndi uwe oji ala anyi na oyo state emela ka amata na ha anwuchiela onye otu ha ahu mgbo egbe ya gburu otu nwata akwukwo gbara naani afo iri na ano na mberede nyere aha dika Kehinde Alade na Ibadan bu isi obodo oyo state unya bu Tuesday.
Onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Oyo State bu CSP Adewale Osifeso mere ka amata nke a na ozi onyefere ndi nta akuko na isi obodo Oyo State unya bu Tuesday.
CSP Osifeso na ozi ya mekwara ka amata na ndi na nille aka aha dina yabu ihe mberede ka anwuchigoro ka odi ugbua.
Dika okowaziri na onye commissioner ndi uwe oji ala anyi na state ahu bu CP Johnson Adenola nyego iwu ka esi a imi nyocha na ala ichoputa ihe kpatara yabu ajo onodu.
Ogakwara na iru kwuputa na yabu nyocha na aga iru ka odi ugbua
CSP Osifeso kwekwara ohaneze nkwa ichoputa ihe kpatara yabu njiji ma gba ya na anwu ka ohaneze wee fu ya.
Yabu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe bekwara akwa ariri maka yabu odachi nke mere oge ojiri nkeji iri ano na ise gafe elekere asaa nke ututu, na oge oru nchekwa okporuzo nke ha rukorita ha na ulo olu oyo state Traffic management Authority.
Na ikpazu ka omere ka amata na yabu njiji jiri oge ha na agba mbo ikwusi ugbala Honda Accord di oji , nwere akara FST 639 JJ nke na agba na okporuzo na uzo iwu na akwadoghi bukwanu nke nna nwata ahu lagoro mmuo na anya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.