Ndị uwe ojii na Kano State anwụchiela mmadụ iri abụọ na asaa ana atụ anya n’aka ha dina ogbugbu nke e gburu onye uwe ojii nọkwa Divisional Police Officer na state ahụ.
Written by Onyinye on May 27, 2025
Ndị uwe ojii ala anyị ngalaba ha nke Kano State police command ekwupụtala ogbugbu nke otu onye uwe ojii ọkwa ya gbagotere nọkwa DPO bụ Baba Ali na council ime obodo Rano nke State ahụ kworo maka esemokwu dapụtara n’etiti hana ndị ntorobịa.
Nkea pụtara ihe site n’akwụkwọ ozi nke onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uwe ojii na Kano State bụ SP Abdullahi Haruna Kiyawa wepụtara ụnyaahụ bụ Monday.
O kwuru na esemokwu malitere n’oge ụmụ afọ obodo ahụ bịara mee mkpesa na nke ndị uwe ojii banyere otú onye ntorobịa bụ Abdullahi Musa bụ onye ha kwuru na o ji ọgba tum tum ya emechisi ndị mmadụ ntị n’obodo ahụ.
Ya bụ ozi gara n’ihu kọwaa na ndị uwe ojii nwuchiri nwoke ahụ mana ha mechara chọpụta na ahụ adịghị ya bụkwa nke ha mere ngwa ngwa buru ya gaa n’ụlọ ọgwụ Rano General Hospital bụ ebe ọ nọrọ nwụọ ụnyaahụ bụ Monday.
Nke ahụ mechara kpalie iwe ndị ntorobịa obodo ahụ bụ ndị nuputara n’igwe bịa munye ogige ndị uwe ojii ahụ ọkụ ma merụọ onye DPO ahụ nnukwu ahụ.
DPO Baba Ali ká e kwuru na e buru ya gaa n’ụlọ ọgwụ Aminu Kano Teaching Hospital bu ebe ya onwe ya nọ kwara nwụọ.
Ndị uwe kọwara na ha anwụchiela mmadụ iri abụọ na asaa maka ya ihe ọdachi ebe ihe niile abụrụla nke dere duu ugbua dịka onye Commissioner ndị uwe ojii na Kano State bụ CP Ibrahim Bakori bịagoro n’ogige ahụ hutagasia ihe ndị e mebiri.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.