Ndị uweojii ala anyị anapụtala otu onye ndi ntọri tọrọ ma nwuchikọ mmadụ asatọ ana enyo enyo na ha bu ndi ntọri na Delta nakwa Kaduna States.

Written by on August 18, 2025

Ndị uweojii ala anyị anapụtala otu onye ndị ntọri tọrọ ma nwuchikọ mmadụ asatọ ana enyo enyo na ha bu ndi ntọri na Delta nakwa Kaduna States n’oge ha nọ ọrụ, dika ha nwetara ọtụtụ ngwa ọgu nakwa mgbo egbe n’aka ha.

Nkea pụtara ihe site n’aka onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uweojii bu DCP Muyiwa Adejobi, dika ọ kọwara na nke ahụ bu agha ndị uweojii na ebu megide ndi ntọri nakwa ndị na agba mgbere ngwa ọgu n’ụzọ iwu na akwadoghi.

Ndị uweojii ala anyị na Kaduna State, napụtara otu onye enyere aha ya dika Hussaini Ibrahim, bu onye atọrọ na Jagindi Tasha Village, dị na Jema LGA na State ahụ, bụkwanụ onye ndị ntọri ahụ hapụrụ rie mbọmbọ ọsọ oge ndị uweojii nọ ọrụ nnapụta ahụ.

Site na nyocha ha, ha nwuchiri mmadụ anọ ana enyo enyo ndị gụnyere, Umar Yusuf Jabiri, Buhari Muhammad amakariri dịka General, Ahmadu Nasiru nakwa Zakari Saleh, dika ha nwetara otu AK-47 rifle nakwa locally fabricated AK-47 rifles abụọ n’aka ha.

Na akụkọ dịka ibe ya, ndị uweojii ala anyị chọpụtara ịbụ ana ebufe sitere Jos nakwa Plateau States, na aga Gusau nakwa Zamfara States, dika achọpụtara AK-47 rifle n’ime akpa ịbụ ahụ ana ebufe, ebe ha nwuchiri Abdulmumni Sani nakwa Naziru Musa, bụkwanụ ndị mere njem gawa na Gusau iji n’ata ngwa ọgu.

Na Delta State, ndị uweojii ala anyị ngalaba CP-Special Assignment Team CP-SAT, na njikọ aka ha na X-Squad and Buffalo Patrol units wakporo ebe ana enyo enyo na ndị ntọri ji mere isi ọnọdụ na Ibusa Road.

Dika ha nwuchiri Chiadiji Collins amakariri dịka Smooth gbara afọ iri anọ na abụọ bu onye eboro ebubo na aka ya dị na ọtụtụ ntọri ana eme na Ibusa, Ogwashi-Uku nakwa mpaghara Asaba, na bee ya dị na Ewulu Community nke Aniocha LGA na Delta State, dika ha nwetara otu AK-47 rifle nakwa 40 rounds of 7.62mm live ammunition n’aka ya.

Otu onye ọzọ ana enyo enyo anwụchiri enyere aha ya dika Ezechie Andrew bukwa onye enwetara egbe pump-action abụọ nakwa live cartridges abụọ n’aka ya.

Ndị uweojii ahụ kọwara na ndi a ana enyo enyo anwụchiri na enyere ha aka na nyocha n’aga n’iru, dika aga akpụkpọ ha n’ụlọ ikpe ngwa ngwa ha mechara nyocha ha.

Onye isi ndị uweojii n’ọkwa Inspector General of Police bu IGP OluKayode Adeolu Egbetokun, toro ndị uweojii ahụ na mbọ ha gbara nakwa mbọ ha na agba iji chụọ ndị omekome ọsọ ụkwụ eru ala, dika ọ gara n’iru riọ ọhaneze ka ha muru anya ka azụ ma kpọturu ndị ọrụ nchekwa mgbe ọbula ha hụtara ihe dị agha na gburugburu ha iji nye aka buo agha megide ndi omekome.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited