Ndị uweojii na mba United Kingdom anwuchiela mmadụ narị ise na iri abụọ na abụọ bu ndi na eme njem ngaghari iwe na London.

Written by on August 11, 2025

Ndị uweojii na mba United Kingdom anwuchiela mmadụ narị ise na iri abụọ na abụọ na London bu isi obodo mba ahụ, kwere maka na ha na eme njem ngaghari iwe emegide kpebie mba United Kingdom kpebiri imechi otu Palestine Action.

Nkea putara ihe site n’aka ndị uweojii ahụ ụnya bu Sunday, dika ha kọwara na ndị ahụ ha nwuchiri bu ndị na eme njem ngaghari iwe na central London’s Parliament Square, dika ha jicha ihe ederede placards bu nke na akwado otu Palestine Action.

Anwụchiri ndị ọzọ na Russell Square bụkwa ndị na eme njem ngaghari iwe kwere maka agha dị mba Israel na egbu na Gaza dị na mba Palestine, bụkwanụ nke gbugoro opekata mpe mmadụ puku iri isii na otu na narị anọ na iri atọ, ma merụo mmadụ otu narị na iri ise na atọ na narị abụọ na iri na atọ ahụ.

Ndị uweojii ahụ gakwara n’iru nwuchikọ mmadụ iri kwere maka ibuso ndị uweojii ọgu, na agbanyeghị na onweghi onye nwetara ihe mmerụ ahụ.

Otu Palestine Action kọwara na ngaghari iwe ahụ bu iji zaghachi mba UK kwere maka na ha na adonyere mba Israel aja n’ukwu na agha ha na ebu emegide Gaza dị na mba Palestine na nzuzo.

Nwa amadi ahụ so chọpụta otu Palestine Action bu Huda Ammori, kọwara na njim ngaghari iwe ahụ bu
jikọ aka ọnụ megide mwakpo nke nwere onwe ha.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited