Nwa amadi ahu ji okwa FCT Minister ekwuputara president tinubu dika onye nzoputa nyere Siminalayi Fubara.

Written by on April 19, 2025

Nwa amadi ahu ji okwa Minister n’ ahu maka isi Obodo anyi bu Nyesom Wike emela ka amata na onobuolari na mbu tuo atumatu maka ichitu aka n’ achi Rivers state bu Governor Siminalayi Fubara,kama na obu site n’ enyemaka President Bola Ahmed Tinubu ka aka ji zoputa ya.

N’ okwu ya oge yana ndi nta akuko n’ enwe mkparita ububo na Abuja tata bu Friday,ka Wike noro kwuputa si, n’ agbanyeghi na owutele ya bu ochichi gbatagbata ahu ekwuputara na Rivers state kama na obu atumatu ejiri zoputa Fubara na ipu n’ okwa ochichi.

Okwuru si na ndi mmadu kwesiri idi n’ ekene President Bola Ahmed Tinubu maka ochichi gbatagbata ahu okwuputara n’ ihi na ewezuga nkea, na agaghizi n’ ekwu make Fubara dika onye no n’ okwa Governor ugbua.

Iga echeta na onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu noro na abali iri na asato nke onwa March afo 2025 kwuputa ochichi gbatagbata na Rivers state ma kwusigodu governor Fubara,osote ya nakwa ulo nzuko omebe iwu state ahu olu dika okpolitere (retd)vice Admiral Ibok Ete Ibas n’ okwa Administrator na state ahu.

K’ osiladi, Nyesom Wike meziri ka amata na ya di njikere ikpa ububo udo nyere Siminalayi Fubara n’ agbanyeghi ebubo ona ebo si na ndi ndumodu Fubara n’ agwa ya ka oghara ikweta n’ yabu ubobo udo ahu .


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited