Nwa amadi ahụ jibu ọkwa Governor na Anambra State emela ka amata na okwu ahụ na efeghari n’ụwa ozi bu okwu asi.
Written by Onyinye on May 30, 2025
Nwa amadi ahụ jibu ọkwa Governor na Anambra State bu Chief Willie Obiano, akagbuola akụkọ ahụ na efeghari n’ụwa ozi bu nke na akọ na ọ na akwado otu onye pụtara izo ọkwa Governor na ntule aka ọchịchị Anambra Governorship Election aga eme n’odi n’iru.
Nkea sochiri dika ahụtara akụkọ na efeghari na uwa ozi ma buru okwu asi bu nke ana agbakwụnye aha ya na ya.
Ozi ahụ n’efeghari boro ebubo na ahụtara Obiano ebe ọ na agwa ụmụ afọ State ahụ okwu gbasara ego ụtụ isi, dika ọ gwara ha na otu onye n’apụta ga eme nke ọma dika aka na chi State ahụ.
Ozi nkachapu okwu ahụ bu nke Paul Nwosu binyere aka na ya ụnya bu Wednesday, kọwara na ozi ahụ n’efeghari n’uwa ozi bu okwu asi ma buru nke na edughie ụzọ, dika ọ gwara ọhaneze ka ha wepuya nuche na ya.
N’okwụ ya, o mere ka amata na onweghi oge Obiano gwara ụmụ afọ State ahụ okwu gbasara ego ụtụ isi, ma ọbu nye onye ọbula ohere maka ịgba ya ajụjụ ọnụ n’iru ohaneze ma ọbu ebe nanị ya nọọ gbasara ntule aka ọchịchị na abịa n’iru ma ọbu soro onye ọbula n’aputa maka ya nye mkparitauka.
Ọ gara n’iru mee ka amata na mgbe ọbula Obiano chọrọ ịkwụ ihe ọbula gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, na ọ ga eji aka ya puta kwuo maka ya, na ọ gaghị esite n’aka mmadụ ma ọbu otu ọbula.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.