Nwa amadi ahu jiburu okwa Deputy speaker ulo nzuko omebe Rivers state agbara onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu nakwa mmadu itolu ndi ozo akwukwo n’ ulo ikpe.
Written by Onyinye on April 26, 2025
Nwa amadi ahu jiburu okwa Deputy speaker ulo nzuko omebe iwu Rivers state bu Rt Hon.Marshall Stanley -Uwom ,agara n’ ulo ikpe federal high court di na Abuja n’ ario ka ha kwusi ochichi etiti idi n’ enyefe ego orubere okpuru ochichi ime Obodo digasi na Rivers state n’ aka onye sole Administrator akpolitere na state ahu bu Rtd vice Admiral ibok Ete Ibas.
Nwa amadi a jiburu okwa onye omebe iwu n’ oge ahu onye Minister isi Obodo anyi a bu Nyelsom Wike ji okwa governor na state ahu, rioro ulo ikpe a,ka ha kwuputa ya dika osiri di na section (7)1 nke 1999 constitution ala anyi dika esiri kpagasia ya aka , tinyekwara nkabi ikpe nke ulo ikpe ekpecha ogwu kabiri,na Ibas enweghi Ike isite n’ usoro iwu nkpolite ndi ana ahoputaghi n’ usoro ntuliaka ,ilu olu dika ndi ochichi nchere oge n’ okpuru ochichi ime Obodo enwegasiri na Rivers state.
Ufodu n’ ihe ndi nwa amadi a n’ ario ulo ikpe gunyere,inye ikikere ka ochichi gbatagbata ahu onye isi ala anyi kwuputara na Rivers state gharazi idi ire.
Ewezuga onye isi ala anyi bu president bola Ahmed tinubu bu onye nke mbu agbara akwukwo a, itolu ndi ozo gunyere:ulo nzuko omebe iwu ogogo etiti ala anyi,ulo nzuko ukwu senate, Senate president, ulo nzuko nnochite anya house of Representatives, nakwa onye speaker house of Representatives.
Ndi ozo aburu, Rtd vice Admiral Ibas, ulo oba ego etiti bu central Bank of Nigeria (CBN) onye account general of the federation tinyekwara otu federation Account Allocation Committee ka ha ga zara onu ha n’ ulo ikpe.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.