Nwamadi ahu ji otu ndoro ndoro ochichi Labour Party zuo okwa onye isi ala na afo 2023 akpokuola umu afo ala anyi ka ha gba mbo nwete ikikere akwukwo vote ha.
Written by Onyinye on August 18, 2025
Nwamadi ahu ji otu ndoro ndoro ochichi Labour Party zuo okwa onye isi ala na afo 2023 bu maazi Peter Obi akpokuola umu afo ala anyi bu Nigeria ka ha gba mbo huna ha debanyere aha maka inwete ikikere akwukwo Permanent Voters Card PVC ha maka itu vote na ntuli aka ochichi izugbe nke afo 2027.
Yabu nwamadi ahu chiburu Anambra state mere ka amata na inwete akwukwo ikikere vote ahu bu mbido ichu nruru aka nakwa ochichi nchigbu oso ukwu aru ala na ala anyi bu Nigeria.
Maazi Peter obi mere ka nke a puta ihe taata bu Monday oge ndi nta akuko na amari ya okwu na onu bukwanu ebe onoro wee kowa na ikikere kachasinu na ochichi onye kwu uche ya bu ikikere akwukwo vote maka na oya ka aga eji wee chupu ndi ajo mmadu na ochichi ma tinayezie ndi mara nke ekwe kuru na ochichi ohakarasi na ala anyi bu Nigeria.
Na ikpazu ka okowara mmadu ire ikikere onwere itu vote na udi nke aporo vote selling na asusu beeke dika ihe jogburu udele ma sigbu nkapi, wee rio ufodu ndi na eme nke ahu ka ha kwusi ya kpam kpam.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.