NWE NKWANYERE UGWU NYERE UKPORO IWU KA PANDEF, URHOBO NA AGWA NDI AGHA NIGERIA MAKA OBODO OKUAMA

Written by on December 12, 2024

Otu ahu jikoro mpaghara Niger Delta amara dika Pan Niger Delta Forum PANDEF nakwa otu jikoro ndi ndu agburu Urhobo akwala ariri megide onwu ufodu ndi ndu ama ama na obodo Okuama nke Ughelli South LGA dina Delta State bukwanu ndi ana akowa na obuna aka ndi agha military ala anyi jichiri ha ka ha noro nwuo.

Ozi kowara na onye President General obodo Okuama bu Pa James Oghoroko noro na abali isii nke onwa December anyi nona ime ya nwuo na aka ndi agha ala anyi jichiri ya na ogige military facility dina Port Harcourt bu obodo Rivers State.

Na otu aka ahukwa ka onye Treasurer yabu obodo bu Pa Dennis Okugbaye noro unya bu Wednesday nwuo na aka ndi agha ala anyi ahu na njichi a ejichiri ha.

Na okwu ya banyere onodu a taata bu Thursday ka onu na ekwuru otu PANDEF bu Dr Christopher Ominimini mere ka amata na ihe otu a jikoro mpaghara Niger Delta choro bu udo na mpaghara ahu.

Okporo oku ezi onodu nrube isi na ukporo iwu nke ahu amara dika Rule of Law na agbanyeghi ka ihe siri di na obodo.

Na nke ya ka mazi Zik Gbemre bu onye na azo maka odimma mpaghara Urhobo kowara onwu ndi ndu obodo Okuama na aka ndi agha ala anyi dika nke ana agaghi anabata na obi ocha.

Nwa amadi a kowara na otu onye okammuta na ihe omumu Physics ma burukwa onye President General obodo Ewu Kingdom nke yabu Okuama bu Prof Arthur Ekpokpo nakwa mmadu ato ndi ozo ka nona aka ndi agha ala anyi na njichi ejichiri ha na Port Harcourt.

Ozi kowara na obu kemgbe onwa March nke afo a bu 2024 egbuchara ndi agha soldiers di mmadu iri na asaa na yabu Okuama ka aka ndi agha military ala anyi kpatara ufodu ndi ndu obodo ahu nakwa ndi ozo ana enyoenyo maka agwa ekperima ahu.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies