Govt Etiti Akpatughariala Aka Na Ebubo Oji Akpughari Abubakar Malami Na Ulo Ikpe
Written by admin on April 16, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Govt etiti ala anyi esepula aka ya na otu ebubo akwukwo ikpe ahu ogbara megide onye ahu jitopuru okwa okaiwu izugbe ala anyi akporo Attorney General of the Federation ma burukwa Minister ikpe nkwumoto bu Abubakar Malami nakwa nwa ya nwoke bu Abdulaziz Malami bukwanu nke ahu boro ha ebubo iji ego akwado agha oluo otunye isi na udi terrorism financing.
Nke a putara ihe site na aka onye isi ndi okaiwu na ekpechitere ochichi etiti bu mazi Akinlolu Kehinde SAN na akwukwo ikpe odegara nke ndozighari iji ebubo na yabu Abubakar Malami ji ngwa ogu na uzo megidere iwu dochie anya nke ahu bu iji ego akwado agha isi ekwe onwu.
Mazi Kehinde gwara ulo ikpe na ahutara egbe nakwa mgbo habu egbe na bee Abubakar Malami dina Birnin Kebbi bu isi obodo Kebbi State.
Ka yabu okaiwu ochichi etiti mechara mkpatughari aka nakwa ndozighari na ebubo ndi a nke mgbakota onu ogugu ha dizi ise ka Malami nakwa nwa ya nwoke gwara ulo ikpe ahu na aka ha di ocha na ebubo ndi a.
Na nke ya oge onutachara nririta uka okaiwu govt etiti nakwa nke Abubakar Malami bu mazi Shuaibu Arua SAN ka Justice Joyce Abdulmalik nke ulo ikpe Federal High Court bukwanu okaikpe nona isi ikpe a mere ka amata na akaebe ahu eburu uzo nara onye a jiburu okwa Attorney General ala anyi nakwa nwa ya nwoke ka dikwa ire.
Justice Abdulmalik yighariziri ikpe a ka oburu na abali iri abuo na isi nke onwa ozo bu May nakwa abali iri na ise nke onwa June afo a bu 2026.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.