Otu Ndorondoro Ochichi ADC Akọwala Ihe Kpatara Ojiri Daa Na Ntụli Aka Governorship Election Emere Na Anambra State Na Afọ 2025

Written by on April 15, 2026

by Chika Nwazu

Onye ji ọkwa odeakwụkwọ nyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị African Democratic Party ADC n’ ogogo etiti ala anyị bụ Rauf Aregbesola agwala ọhaneze ihe mere otu ndorondoro ahu jiri daa na ntụli aka Governorship Election emere n’abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Novemba n’afọ 2025 na Anambra State yana nke ndị isi oche okpuru ọchịchị ime obodo emere na Abuja n’abalị iri abụọ na isii nke ọnwa February afọ 2026.

O kwuru nke a n’oge ọgbakọ ukwu National convention otu ndọrọndọrọ ọchịchị ADC malitere ụnyaahụ bụ Tuesday na Abuja.

Aregbesola kwuru na ọ bụ kworo maka ọgba aghara ime ụlọ ha na-enwe, enweghị ọkpụrụkpụ ego ha ji akwado otu ndorondoro ha yana agbaghi mgbọrọgwụ na ụfọdụ ebe kpatara ha jiri daa na ntụli aka ahụ.

O mere ka amata na ha esila na ya mụta ọtụtụ ihe ma dị njikere maka nke aka ga-achị Ekiti yana Osun State aga eme n’oge na-adịghị anya.

Ịga echeta na ntụli aka FCT Area Council elections emere n’afọ a ka otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress APC meriri na okpuru ọchịchị ime obodo ise ebe ogbo ya bụ People’s Democratic Party PDP were otu nke fọrọ afọ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited