Umunwaanyi Sitere Abia State Emela Ngaghari Iwe Na Ebubo Ike Ojo Ndi Nchekwa Na State ahu
Written by admin on April 15, 2026
by Maduabuchi Onwe
Umunwaanyi sitere obodo Amanato Eziama Nneato nke dina Umunneochi local government area na Abia state emela ngaghari iwe megide onodu ndi oru nchekwa si wee na anwuchiko ndi ntorobia na obodo ahu.
Habu umunwaanyi mere yabu ngaghari iwe na ubochi Tuesday abali iri na ano nke onwa April afo a bu 2026 wee wuchie ma mechie isi ulo olu government state ahu dina Umuahia bu isi obodo Abia state.
Dika ha mere ka amata site na ihe edere ede placards ha jigasi na aka na nnukwute ujo ji ha kwere maka etu ndi oru nchekwa si wee na akpukoro ndi ntorobia kwa ubochi na obodo ahu bukwanu nke mere ka otutu na ime ha wee na arahuzi na ime ohia ebe ha na ezo onwe ha ka aghara ihu ha.
Otu onye na ime umunwaanyi ahu iwe di na obi enyere aha dika Madam Janeth Nwankwo mere ka amata na obu esemokwu okere ala karigoro afo olemole na obodo ahu bu ihe butere yabu nwuchiko ndi ntorobia na agbanyeghi na yabu okwu ka noo na ulo ikpe.
Na ikpeazu ka onye eze ndi olu na okwa chief of staff nyere aka na achi Abia state bu Caleb Ajagba kwere nkwa na government state ahu ga esi imi nnyocha na ala choputa ihe butere yabu ajoo onodu na state ahu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.