Ogbaghara ohuru atashurula n’ etiti mba Russia nakwa Ukraine dika onye isi ala mba Russia juru inabata atumatu iwusagodu ngwa ogu.
Written by Onyinye on March 19, 2025
Mba Russia nakwa Ukraine amalitela nkwaso igbudu ohuru nke ha jiri gbarisia akuru ngwa arunyegasiri na mba ha di iche iche dika onye isi ala mba Russia juru inabata atumatu iwusagodu ngwa ogu mkpuru ubochi iri ato mba US kporo oku ya.
Onye isi ala nke mba Ukraine bu President Volodymyr Zelensky mere ka amata na mba Russia nekwasara anya igbaricha akuru ngwa ohaneze n’ otu ntabi anya tinyekwara ulo ogwu di na mpaghara sumy.
President Vladimir Putin kwenyere na iwusagodu agha nkusu gara akuru ngwa ikike oku ruo mkpuru ubochi iri ato n’ oge yana president Donald Trump nke mba America nwere nkparita ubobo unya bu Tuesday ma ju atumatu nke ikwusi agha nkusu kpamkpam.
Nwa amadi ahu ji okwa US envoy bu Steve witkoff mere ka amata na mkparita ububo banyere mba Ukraine ka ga aga n’ iru ubochi uka na mba Saudi Arabia.
Iga echeta na oge ahu ana enwe mkparita ububo,na president Vladimir Putin nakwa Donald Trump nwere nkwekorita na mba Russia nakwa Ukraine ga agbanwe ndi nkporo di mmadu otu nari na iri asaa na ise n’ otu ubochi.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.